OGADIMA

Ihe ojoo jo njo
Ihe iske - uwa ojoo
Echiela m onu na-ala.
Atala m aja
Nou ntu dika mmiri.
Ndi mmadu wurum na-ala.

Ahula m uwa - uwa ojoo
Ma chere
Obi m dajuo
N'ihi na Chi nke m na-efe
Ga ebuli m elu
Mee ka onu ochi wa mu
Mee ka onu m sa mbara
Ma mekwa ka mkpi m di elu ozo.

Eh! Ihe ga-agara m nke oma
Abu m onye uwa oma
na atumadi ihe mmekpa ahu
Nke diri m taa.

Agaghim ele anya n'ala
N'ihi na agaghim ala ala.
Aghaghim ile anya n'azu
N'ihi na-abughim onye ikpeazu.

Enwere m olile anya?
Eh Ogadimma.
Ekwere m ekwe?
Eh! Ogadimma.

Gini? Obu Nna m
nke bi n'Igwe
New elu, nwe ala...
Odighi ihe koro m.

Aga m emeghe onu m mbara
Ka Chukwu Abiama
Mejuputa mu na ngozi;
Ogadimma.

Echi ga-abu echi oma
Ogadimma
Chere, obi m
Dere du, obi m
Ogadimma.


- Stefn Sylvester Anyatonwu

Enjoyed reading? Please help my blog grow by leaving a comment and sharing with friends. 
Thank you!